2Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà? Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.
3Gini mere aguworo ayi ka anumanu? Ayi aghọwo ndi ruru árú n'anya-unu.
4Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya. Àgārapu uwa n'ihi gi? Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?
5Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu, Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.
6Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya, Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.
7Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya, Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.
8N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu, Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.
9Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu, Ọnyà gāma ya.
10Ezobeworo ya udọ̀ n'ala, Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ.
11Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.
12Agu ganāgu ume-ya, Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya.
13Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya, Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.
14Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya; Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.
15Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya: Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya.
16Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru, Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.
17Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa, Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.
18Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri, Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.
19Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya, Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.
20Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru, Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.
21Otú ọ di, ndia bu ebe-obibi nke ajọ omume, Nka bu kwa ebe onye nāmaghi Chineke.