JOB 19:1-29 IGBOB1970 - Bible AI

1Job we za, si,

2Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú? Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam?

3Ub͕ò iri ndia ka unu nēme ka ihere mem: Ihere adighi-eme unu na unu nēmejọm.

4Ọzọ kwa, ọ bu ezie na emehiewom n'amaghi-ama, Ma n'ebe m'nọ ka nmehiem m'mehiere n'amaghi-ama di.

5Ọ buru na ọ bu ezie na ọ bu imegidem ka unu nēme onwe-unu uku, Ọ buru kwa na unu ewere ita-utam som ru uka:

6Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ, Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.

7Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam: Anametiku Chineke, ma ikpé adighi.

8Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa, N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.

9O yipuwo nsọpurum n'arum dika uwe, We wezuga okpu-eze n'isim.

10Ọ nākwatum buruburu, m'we la: O we ropu olile-anyam dika osisi.

11O me ka iwe-Ya di ọku imegidem, Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.

12Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem, Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm.

13O mewo ka umu-nnem nọpurum n'ebe di anya, Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n'ebe m'nọ.

14Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo, Ndi m'mara echezọwokwam.

15Ndi nọ n'ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n'onye ala ọzọ: Onye anāmataghi ka m'ghọworo n'anya-ha.

16Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam, Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara.

17Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ, Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara.

18Ọbuná umu nāṅu ara ajuwom; Ọ buru na ebiliem, ha we nēkwugidem.

19Ndi-ìzum nile nākpọm ihe-árú: Ndi ahu m'huru n'anya echighariwo imegidem.

20Ọkpukpum nārapara n'akpukpọ-arum na n'anu-arum, M'we were akpukpọ ezém wepuga onwem.

21Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm; N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru.

22N'ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke? N'ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ?

23Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n'akwukwọ ub͕u a! Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n'akwukwo!

24Ma asi na eji pen ígwè na òpù Ka ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi!

25Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu, Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu:

26Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka, Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke:

27Onye mu onwem gāhuru onwem, Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ. Akurum abua agwusiwo n'imem.

28Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya? Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;

29Tuanu ujọ n'iru mma-agha: N'ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha, Ka unu we mara na ikpé di.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>