JOB 20:1-29 IGBOB1970 - Bible AI

1Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim, Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem.

3Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere, Mọ nke nghọtam nāzakwam.

4Ì mawo nka site na mb͕e ochie, Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,

5Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?

6Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe, Isi-ya ewe metu igwe-oji;

7Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi: Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?

8Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.

9Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ; Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.

10Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye, Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.

11Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya, Ma o gēso ya dina n'elu ájá.

12Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya, Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;

13Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya, Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;

14Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo, Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya.

15O lodawo àkù, we b͕oputa ya: Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.

16Nsi aju-ala ka ọ gāmiri: Ire agwọ gēb͕u ya.

17Ọ gaghi-ele miri-iyi anya, Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.

18Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya; Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.

19N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha; Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.

20N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya, Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.

21Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi; N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.

22N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya: Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.

23Ka o rue, n'iriju afọ-ya, Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya, Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.

24Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga, Uta ọla gāb͕apue ya.

25Ọ dọputawo ya, o we si n'aru-ya puta: Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n'òlùlù-ya puta; Oké ujọ nile di n'aru ya.

26Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba: Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya; Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya.

27Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya, Ala nēbili kwa imegide ya.

28Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n'ala ọzọ, Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n'ubọchi iwe-Ya.

29Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n'aka Chineke, Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>