JOB 21:1-34 IGBOB1970 - Bible AI

1Job we za, si,

2Nurunu okwum nke-ọma; Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu.

3Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu; Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì.

4Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m'nātamuru ntamu? Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ?

5Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru, Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu.

6Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji, Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum.

7Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu, Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà?

8Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha, Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha.

9Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu, Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha.

10Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie; Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime.

11Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu, Umu-ha nēte kwa egwú.

12Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara, Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà.

13Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma, Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ.

14Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi; N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ.

15Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya? Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ?

16Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di: Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.

17Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?

18Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?

19Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya. Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.

20Ka anya-ya abua hu nbibi-ya, Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.

21N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri, Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?

22Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.

23Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè, Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:

24Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi, Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.

25Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi, Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.

26Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ, Ikpuru nēkpuchi kwa ha.

27Le, amawom èchìchè-unu, Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.

28N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di? Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?

29Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ? Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha?

30Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?

31Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya? Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya?

32Ma agēburu onye ahu rue ílì, Ọ gēche kwa nche n'elu obo-ya.

33Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ, Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu, Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ.

34Ùnu si kwa aṅa kasiem obi n'efu, Ebe nání nmekpu fọduru nime nzaghachi nile unu?

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>