JOB 23:1-17 IGBOB1970 - Bible AI

1Job we za, si,

2Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu: Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.

3Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m'gāchọta Ya! Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike!

4Ka m'do ikpém n'usoro n'iru Ya, Meju kwa onum n'iru-uka.

5Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim, Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim.

6Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe? É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.

7N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka; Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.

8Le, m'ga n'iru, ma Ọ nọghi ya; M'ga kwa n'azu, ma adighm-ahuta Ya:

9M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya: Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.

10N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.

11Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso; Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.

12Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya; Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.

13Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya? Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.

14N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm: Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.

15N'ihi ya ka m'nāma jijiji n'iru Ya; Anamaghọta, m'nātu kwa oké egwu Ya.

16N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri, Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji:

17N'ihi na ekpochapughm n'iru ọchichiri, O kpuchighi kwa oké ọchichiri n'irum.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>