JOB 24:1-25 IGBOB1970 - Bible AI

1Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e? Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile?

2Ufọdu nēwezuga ókè-ala; Ha anapuwo kwa ìgwè aturu n'ike, we nāzù ha.

3Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei, Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.

4Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye: Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù.

5Le, dika inyinya-ibu-ọhia n'ọzara Ka ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike; Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri.

6N'ọhia ka ha nile n'otù n'otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi; Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n'ubi-vine onye nēmebi iwu.

7Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.

8Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha, Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume.

9Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike, Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:

10Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;

11N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu; Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku.

12Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè, Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke: Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.

13Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè; Ha amataghi uzọ-ya nile, Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile.

14Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye; N'abali kwa ọ di ka onye-ori.

15Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama, Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim: Ọ nēzobe iru-ya.

16O gwupúwo ulo n'ọchichiri: N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ; Ha amaghi ìhè.

17N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu; N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.

18Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu; Anākọcha òkè-ha n'uwa: Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru.

19Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike: Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo.

20Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri; Agaghi-echeta kwa ya ọzọ: Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.

21Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa; Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma.

22Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya: O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu.

23Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya; Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha.

24Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi; Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile, Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.

25Ma ọ buru na ọ dighi otú a ub͕u a, ònye gēme ka amara na abum onye-ugha, Me okwum ka ọ buru ihe-efu?

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>