JOB 25:1-6 IGBOB1970 - Bible AI

1Bildad, bú onye Shua we za, si,

2Ọchichi na oké egwu di n'aka-Ya; O nēme udo n'ebe-Ya nile di elu.

3Usu-Ya, hà nwere ọnu-ọgugu? Ònye kwa ka ìhè-Ya nādighi-awakwasi?

4Màdu gēsi kwa aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke? Ma-ọbu, ò gēsi aṅa di ọcha n'obi, bú onye nwayi muru?

5Le, ọbuná ọnwa adighi-eti, Ọzọ, kpakpando adighi ọcha n'anya-Ya:

6Ò gēsi kwa aṅa di ọcha, bú madu, nke bu nání ikpuru? Ma-ọbu nwa nke madu, nke bu nání idide?

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
v>