2Ọchichi na oké egwu di n'aka-Ya; O nēme udo n'ebe-Ya nile di elu.
3Usu-Ya, hà nwere ọnu-ọgugu? Ònye kwa ka ìhè-Ya nādighi-awakwasi?
4Màdu gēsi kwa aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke? Ma-ọbu, ò gēsi aṅa di ọcha n'obi, bú onye nwayi muru?
5Le, ọbuná ọnwa adighi-eti, Ọzọ, kpakpando adighi ọcha n'anya-Ya:
6Ò gēsi kwa aṅa di ọcha, bú madu, nke bu nání ikpuru? Ma-ọbu nwa nke madu, nke bu nání idide?