JOB 26:1-14 IGBOB1970 - Bible AI

1Job we za, si,

2Ì siwo aṅa yere ya aka, bú onye nēnweghi ike? Í siwo aṅa zọputa ogwe-aka nke ume nādighi?

3Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe? Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n'uba?

4Ònye ka i gosiworo okwu? Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta?

5Ndi nādighi ndu nāma jijiji N'okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya.

6Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere.

7Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu, O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe.

8Ọ nēkechi miri n'oké igwe-oji-Ya; Ma ab͕awaghi igwe-oji n'okpuru ya.

9Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike, Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya.

10Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri, Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.

11Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji, Ibobo nānwu ha site n'ibasi-nba-ike-Ya.

12Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du, Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.

13Esitere n'aka Mọ-Ya chọ elu-igwe nma; Aka-Ya adupúwo agwó nāb͕a ọsọ.

14Le, ndia bu nání nsọtu uzọ-Ya nile: Le kwa otú ọ di ntà, bú ntakwu okwu anuworo bayere Ya! Ma éb͕è-elu-igwe nke idi-ike-Ya nile, ònye gāghọta ya?

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>