2Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na adim dika m'si di n'ọnwa gara aga, Dika n'ubọchi nile mb͕e Chineke nēdebem;
3Mb͕e o nēnwu n'elu isim, bú oriọna-Ya, Ìhè-Ya ka m'nēji eje ije n'ọchichiri;
4Otú m'diri n'ubọchi ihe nāgaram nke-ọma, Mb͕e ìzù nzuzo Chineke dikwasi ulo-ikwūm;
5Mb͕e Onye puru ime ihe nile nānọyerem, Mb͕e umu-ntakirim nọrom buruburu;
6Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile, Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu!
7Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo, Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá,
8Umu-okorọbia hurum, zobe onwe-ha, Ndi kara nká biliri, guzo;
9Ndi-isi kwubìri okwu nile ha, Tukwasi ọbu-aka-ha n'ọnu-ha;
10Anubìri olu ndi-ndú, Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha;
11N'ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma; Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà:
12N'ihi na m'mere onye ewedara n'ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya, Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka.
13Ngọzi nke onye nāla n'iyì nābiakwasim: M'nēme kwa obi nwayi di-ya nwuru ka o tie nkpu ọṅù.
14Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya: Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.
15Anya ka m'ghọro n'ebe onye-ìsì nọ, Ukwu n'ebe onye-ngwurọ nọ ka m'ghọ-kwa-ra.
16Nna ka m'buru ndi-ob͕eye: Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.
17M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume, Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.
18M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume, Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba:
19Awasawo nkpọrọgwum n'ebe miri di, Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n'alakam:
20Nsọpurum di ọhu nimem, Utam gāb͕anwe kwa ọhu n'akam.
21Mu ka madu gere nti, we chere, Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum.
22Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua; Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.
23Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo; Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu.
24M'chìa ha ọchì, ha adighi-ekwere; Ha adighi-eme kwa ka ìhè irum da.
25M'nārọputa uzọ-ha, nọdu kwa ka onye-isi, Biri kwa dika eze si ebi n'usu-ya, Dika onye nākasi ndi nēru újú obi.