JOB 3:1-26 IGBOB1970 - Bible AI

1Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya.

2Job we za, si:

3Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì, Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke.

4Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri; Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya, Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya.

5Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya; Ka igwe-oji biri n'elu ya; Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.

6Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya: Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ; Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa.

7Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà; Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.

8Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu, Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan.

9Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri: Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa; Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya:

10N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta, O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam.

11N'ìhi gini ka m'nēsighi n'àkpà-nwa nwua? N'ìhi gini ka m'nāputaghi n'afọ kubìe ume?

12Gini mere ikperè abua di n'irum inaram? Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua?

13N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jū M'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:

14Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa, Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;

15Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo, Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:

16Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo; Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?

17N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu; Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.

18N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū; Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike.

19Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua; Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.

20N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè? N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?

21Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia; Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;

22Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù, Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.

23N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè, Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?

24N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia, Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri.

25N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim, Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram.

26Anọghm n'udo, anọghkwam jū, ezughkwam ike; Ma ime-nkpatu biara.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
v>