JOB 30:1-31 IGBOB1970 - Bible AI

1Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim, Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem.

2Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram? Ndi ike nke agadi-ha laworo n'iyì.

3N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa: Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga.

4Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi; Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.

5Anēsi n'etiti madu chupu ha; Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori.

6N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi, Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume.

7N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu; N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.

8Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha; Apiapuwo ha n'ala.

9Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara, M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.

10Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ, Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum.

11N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala, Ha achipuwo kwa bridle n'irum.

12N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili; Ukwum abua ka ha nupuworo, We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.

13Ha emebiwo uzọm, Ha bara nmebim urù, Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.

14Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia: N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.

15Ihe-egwu echighariwo imegidem, Ha nāchu ọkakam dika ifufe; Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.

16Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri; Ubọchi nweda-n'ala nējidem.

17N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum, Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.

18Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari: Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.

19Ọ tubàwom n'apiti, M'we yie ájá na ntu.

20Anametiku Gi, ma I dighi-azam: Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.

21I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere: I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.

22I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya, I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.

23N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.

24N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide; Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia.

25Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike? Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye?

26Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra; M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara.

27Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū; Ubọchi nweda-n'ala nile abiawo n'irum.

28Ejeghariwom nēji nji, ọ bughi anyanwu mere ya: Ebiliwom ọtọ nime nkpọkọta madu, tikue Chineke.

29M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne, Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì.

30Akpukpọ-arum di oji, nādapu n'arum, Ọkpukpum erewo kwa ọku site n'ikpọ-nku.

31Ubọ-akwaram we ghọ iru-újú, Ọ̀jàm ghọ-kwa-ra olu ndi nākwa ákwá.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>