JOB 31:1-40 IGBOB1970 - Bible AI

1Mu na anyam abua b͕ara ndu; M'gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya?

2N'ihi na gìni bu òkè nke Chineke sitere n'elu? Ma-ọbu ihe-nketa nke Onye puru ime ihe nile sitere n'ebe di elu?

3Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ, Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?

4Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile, Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?

5Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari, Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ;

6(Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume, Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)

7Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya, Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu, Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:

8Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie; Ka eropu kwa umu nke putara n'arum.

9Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi, M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem:

10Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri, Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n'elu ya.

11N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ; Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:

12N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia, Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.

13Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi, Mb͕e mu na ha nēse okwu:

14Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili? Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya?

15Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya? Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?

16Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ, Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;

17Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním, Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya;

18(Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya, Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)

19Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe, Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;

20Ọ buru na úkwù-ya agọzighm, Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;

21Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei, N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama:

22Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu, Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya.

23N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu, Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.

24Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum, Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim;

25Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne, Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;

26Ọ buru na ajum ìhè mb͕e o nēnwu, Ma-ọbu ọnwa mara nma mb͕e ọ nāga ije;

27Ewe rafue obim na nzuzo, Akam we sutu ọnum ọnu:

28Nke ahu bu kwa ajọ omume ndi-ikpe gēkpe: N'ihi na n'ime ihe a m'gāgọnari Chineke Nke di n'elu.

29Ọ buru na aǹuriam n'ọdida nke onye nākpọm asi, Ma-ọbu kpọte onwem mb͕e ihe ọjọ chọtara ya;

30(Ma enyeghm okpo-ọnum uzọ imehie N'iji ọb͕ub͕a-iyi riọ ndu-ya;)

31Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ!

32Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali; Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di.

33Ọ buru na ekpuchiwom njehiem nile dika Adam, N'izobe ajọ omumem n'obim,

34N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba, Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ, M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua-

35Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti! (Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;) Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!

36N'ezie n'ubum ka m'gēburu ya; M'gēke kwa ya n'isim dika okpu-eze.

37M'gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum; Dika onye-ndú ka m'gābiaru Ya nso.

38Ọ buru na alam etie nkpu megidem, Ọ buru kwa na ọ̀b͕à-ya nile akwakọ ákwá;

39Ọ buru na eriwom ihe-ọmume-ya nēnyeghi ego, Ma-ọbu me ka ndi-nwe-ya kubìe ume-ndu-ha:

40Ka ọhia-ogwu puta n'ọnọdu ọka wheat, Ka ahihia nēsì ísì ọjọ puta kwa n'ọnọdu ọka barley.

40Okwu Job agwusia.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>