1Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya.
2Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke.
3Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe.
4Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha.
5Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku.
6Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si, Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká; N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara.
7Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu, Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.
8N'ezie mọ di nime madu, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.
9Ọ bughi ndi uku mara ihe, Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.
10N'ihi nka ka m'siri, Gem nti; M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.
11Le, echerem okwu-unu, Anamaṅa nti nghọta-unu, Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile.
12E, anamelekwasi unu anya, Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka, Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu.
13Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe; Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu:
14N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem; M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.
15Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ: Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha.
16M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu, N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?
17M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem, M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.
18N'ihi na ejuputaram n'okwu; Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom.
19Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu; Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa.
20Ka m'kwue, ka aru we dajuam; M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za.
21Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma; M'gaghi-etu kwa madu aha.
22N'ihi na amaghm itu aha; Ọ buru otú a Onye kèrem gēbupum na nwa mb͕e ntà.