JOB 33:1-33 IGBOB1970 - Bible AI

1Ma otú ọ di, biko, Job, nuru okwum nile, Ṅa kwa nti okwum nile.

2Biko, le, asaghewom ọnum, Irem ekwuwo n'okpo-ọnum.

3Okwu-ọnum nile gēkwuputa izi-ezi nke obim: Ihe eb͕ub͕ere-ọnum mara ka ha kwuworo n'idi-ọcha.

4Mọ nke Chineke emewom, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka m'di ndu.

5Ọ buru na i puru, zaghachim; Do okwu-gi n'usoro n'irum, guzo onwe-gi.

6Le, mu onwem di ka i si di n'ebe Chineke nọ: Site n'urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem.

7Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku, Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n'aru-gi.

8N'ezie i kwuwo na ntim, Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,

9Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie; Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:

10Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa, Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;

11O nētiye ukwum abua nime ọtọsi, Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.

12Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi: N'ihi na Chineke di uku kari madu.

13Gini mere i ji so Ya se okwu, Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?

14N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu, E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.

15Na nrọ, bú ọhù nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu, N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;

16Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu, Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,

17Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya, Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;

18Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù, Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.

19Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya, Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile:

20Nri we nāsọ ndu-ya oyi, Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.

21Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya; Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu.

22Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù, Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.

23Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya, Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri, Igosi madu izi-ezi-ya;

24Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si, Dọputa ya n'irida n'olùlù, Achọtawom ihe-nb͕aputa.

25Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwata Ọ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya:

26Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ; O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya: O we nyeghachi madu ezi omume-ya.

27Ọ nābù abù n'iru madu, si, Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume, Ma ọ baghm n'ihe:

28Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n'igabiga ba n'olùlù, Ndum gēle kwa ìhè.

29Le, ihe ndia nile ka Chineke nālu, Ub͕ò abua, ma-ọbu ub͕ò atọ, n'ebe madu nọ,

30Ime ka nkpuru-obi-ya si n'olùlù lata, Ka ewe were ìhè nke ndu nye ya ìhè.

31Job, ṅa nti, gem nti: B͕a nkiti, na mu onwem gēkwu.

32Ọ buru na okwu adi n'ọnu-gi, zaghachim: Kwue, n'ihi na ọ dim utọ igu gi n'onye ezi omume.

33Ọ buru na okwu adighi, gi onwe-gi gem nti: B͕a nkiti, na m'gēzi gi amam-ihe.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>