2Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi? Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke?
3Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi? Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem?
4Mu onwem gāzaghachi gi, Gi na ndi-eyì-gi.
5Legide elu-igwe anya, hu; Kiri kwa mbara-ígwé nile nke di elu kari gi.
6Ọ buru na i mehiewo, gini ka i nēmegide Ya? Ọ buru kwa na njehie-gi abawo uba, gini ka i neme Ya?
7Ọ buru na i bu onye ezi omume, gini ka i nēnye Ya? Ma-ọbu gini ka Ọ nānara n'aka-gi?
8Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi; Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu.
9N'ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu; Ha nētiku onye gēyere ha aka n'ihi ogwe-aka ndi di ike.
10Ma ọ dighi onye siri, Òle ebe Chineke nọ, bú Onye merem, Onye nēnye abù ọma n'abali;
11Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa, Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?
12N'ebe ahu ka ha nēti nkpu, ma Ọ dighi-aza, N'ihi npako di ọjọ.
13N'ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu, Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya.
14Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya, Okwu-ikpe-gi di n'iru Ya, i gēchere kwa Ya.
15Ma ub͕u a, n'ihi na iwe-Ya eletaghi, Na n'ihi na Ọ ribaghi njehie ama nke-uku;
16N'ihi ya ka Job nāsaghepu ọnu-ya n'efu; Ọ bughi n'ọmuma-ihe ka O nēme ka okwu-ya nile ba uba.