JOB 36:1-33 IGBOB1970 - Bible AI

1Elaihu we nēkwu kwa, si,

2Cherem nwa mb͕e ntà, m'gēkwuputa-kwa-ra gi; N'ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke.

3M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem, Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume.

4N'ihi na n'ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu: Onye zuru okè n'ọmuma-ihe nọyere gi.

5Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula: Ọ di ike n'ike nke obi.

6Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu: Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.

7Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume: Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-eze Ka Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.

8Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala, Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;

9O we nēgosi ha ọlu-ha, Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya.

10O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti, Ọ si ha si n'ajọ ihe laghachi.

11Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè, Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n'ọdi-nma, Me kwa ka arọ nile ha gwusia n'ihe-utọ.

12Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha, Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.

13Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi: Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.

14Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata, Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.

15Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya. Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.

16Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕u Ba n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya; Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.

17Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu: Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.

18N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe; Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.

19Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà? Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?

20Ekusila ume ike ibiaru abali, Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.

21Lezie anya, echela ajọ ihe iru: N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.

22Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya: Ònye bu onye-ozizí dika Ya?

23Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya? Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?

24Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku, Bú nke madu bùworo abù bayere ya.

25Madu nile elewo ya anya; Madu nēlegide ya site n'ebe di anya.

26Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya; Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.

27N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri, Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:

28Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba.

29Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-oji Nbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?

30Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya; Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.

31N'ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe; Ọ nēnye ihe-oriri n'uba.

32Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua; We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya.

33Nkpọtu-ya nēgosi ihe bayere Ya, Gosi kwa anu-ulo ihe bayere Onye nārigo.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>