2Ònye bu onye a nke nēme ka ndum-ọdu b͕a ọchichiri Site n'okwu ọmuma-ihe nādighi?
3Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju kwa gi, gi me kwa ka M'mara.
4Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa? Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.
5Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara? Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?
6N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie? Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya,
7Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù, Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike?
8Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri, Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;
9Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya, Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,
10M'we kpawara ya ókèm, Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ,
11Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya; N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?
12Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu, Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya;
13Ka o we jide akuku nile nke uwa aka, Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?
14Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà; Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe:
15Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n'ebe ndi nēmebi iwu nọ, Anānyaji kwa ogwe-aka di elu.
16Ì bàwo n'ebe-nsuputa nile nke oké osimiri? Ma-ọbu ì jeghariwo n'ebe michasiri emi nke ob͕u-miri?
17Èkpugheworo gi ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu? Ma-ọbu ì nāhu ọnu-uzọ-ama nke onyinyo ọnwu?
18Ì ghọtawo rue obosara uwa? Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.
19Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè? Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya;
20Nke i gēwere ya je n'ókè-ala-ya, Nke i gāghọta kwa uzọ nile nke ulo-ya?
21I mawo, n'ihi na mb͕e ahu ka anāmu gi, Ọnu-ọgugu ubọchi-gi ri-kwa-ra nne!
22Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow, Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,
23Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà, Nye ubọchi ọ̀gù na agha?
24Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe anēkesa ìhè, Ebe anāb͕asa ifufe ọwuwa-anyanwu n'elu uwa?
25Ònye waworo uzọ-miri nye iju-miri, Ma-ọbu uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe;
26Ime ka miri zokwasi ala ebe ọ dighi onye ọ bula bi; Bú ọzara madu nēbighi nime ya;
27Ime ka afọ ju nkpọnkpọ-ebe nke tọb͕ọrọ n'efu; Na ime ka o pue, bú npuputa ọhu nke ahihia ndu?
28Miri-ozuzo, ọ̀ nwere nna? Ma-ọbu ònye muworo nkpuru igirigi?
29N'àfọ onye ka ice nēsi puta? Hoar-frost nke elu-igwe kwa, ònye muworo ya?
30N'ihe dika nkume ka miri nēzobe onwe-ha, Iru ob͕u-miri nāraru kwa araru.
31Ì nēkekọta iru-utọ Pleiades, Ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion?
32Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya? Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya?
33Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe? Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n'uwa?
34Ì nēweli olu-gi elu rue igwe-oji, Ka njubiga miri we kpuchie gi?
35Ì nēzipu àmùmà, ka ha we je, Si kwa gi, Le ayi?
36Ònye tiyeworo amam-ihe n'akuku di nime? Ma-ọbu ònye nyeworo akọ-na-uche nghọta?
37Ònye nāgu mbara-ígwé ọnu site n'amam-ihe? Ma-ọbu ònye nātọb͕ọ karama-akpukpọ nile nke elu-igwe ib͕apu miri-ha,
38Mb͕e ájá nāghọ urọ, Mb͕e ọkpurukpu-ájá nile nārapara n'aru onwe-ha?
39Ì nāchuru nne-ọdum anu-ndọb͕u? Ma-ọbu ì nēme ka afọ-iri-nri umu-ọdum ju,
40Mb͕e ha nāmakpu n'ebe-obibi-ha, Nọdu kwa n'okwu-ọhia iche anu?
41Ònye nēdoziri ugolo-ọma ihe-oriri-ya, Mb͕e umu-ya nētiku Chineke, Nāwaghari nēnweghi ihe-oriri?