JOB 39:1-30 IGBOB1970 - Bible AI

1Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa? Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa?

2Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu? Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa?

3Ha nēruru ala, muputa umu-ha, Tuzuga ihe-nb͕u-ha.

4Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia; Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha.

5Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya? Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?

6Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya, Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya.

7Ọ nāchì ùzù obodo ọchì, Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike.

8Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya, Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.

9Àtu gēkwe ibu orù-gi? Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi?

10Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi? Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?

11Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne? Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?

12Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi, Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?

13Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu; Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?

14N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala, Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,

15O we chezọ na ukwu gāzọpia ha, Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.

16O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere: Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;

17N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe, O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.

18Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ, Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.

19Ì nēnye inyinya idi-ike-ya? Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?

20Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube? Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.

21Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya: Ọ nāpu izute ihe-agha.

22Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ; Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu.

23Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya, Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.

24Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala; Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.

25Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe! Ọ bu kwa site n'ebe di anya ka ọ nānu ísì agha, Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu.

26Ọ̀ bu site na nghọta-gi ka eb͕é nēfego n'elu, B͕asa kwa nkù-ya n'ebe Ndida di?

27Ọ̀ bu n'okwu-ọnu-gi ka ugo nēfeli elu, Ma-ọbu me akwu-ya ka ọ di elu?

28N'elu nkume di elu ka o nēbi, nọ kwa ọnọdu-abali, N'elu ọnu nkume di elu na ebe ewusiri ike.

29Site n'ebe ahu ka o nyoputaworo ihe-oriri; Anya-ya abua nēsi n'ebe di anya legide ya.

30Umu-ya nāmicha kwa ọbara: Ọzọ, ebe ndi eb͕uru eb͕u di, n'ebe ahu ka ọ nọ.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>