7Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara.
8Ì nēmebi kwa ikpém? I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?
9Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?
10Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma; Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.
11Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi: Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala.
12Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala; Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.
13Zobekọ ha n'ájá; Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.
14Emesia Mu onwem gēkele kwa gi, Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.
15Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi.
16Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.
17Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.
18Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.
19Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke: Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.
20N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya; Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.
21N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina, N'ebe nzuzo nke amì, na apiti.
22Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya; Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu.
23Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.
24Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya? Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?