1Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi? Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya?
2Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya? Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?
3Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara? Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?
4Ò gēso gi b͕a ndu? Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi?
5Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu? Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi?
6Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia? Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia?
7Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya? Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya?
8Tukwasi ya ọbu-aka-gi; Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ.
9Le, nchere-ya bu ihe-ugha: Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya?
10Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya: Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum?
11Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi? Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.
12M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru, Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya.
13Ònye kpugheworo iru uwe-ya? Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?
14Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya? Ezé-ya di oké ujọ buruburu.
15Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya, Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.
16Dika otù si nọ ibe-ya nso, Ifufe adighi-abà n'etiti ha.
17Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya; Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.
18Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu, Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.
19N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa, Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.
20N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa, Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.
21Iku-ume-ya nāmunye icheku, Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.
22N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya, Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.
23Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha: O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya.
24Obi-ya siri ike dika nkume; O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.
25Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ: Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ.
26Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike; Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.
27Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka, Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.
28Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga: Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.
29Anāgu ndele n'ahihia-ọka: Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.
30Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ: Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.
31Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite: Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.
32Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya; Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.
33Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa, Nke emeworo nēnweghi ujọ.
34Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu: Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga.