JOB 5:1-27 IGBOB1970 - Bible AI

1Biko, kpọ òkù; ọ̀ di onye nāza gi? Ònyè n'etiti ndi nsọ ka i gēche kwa iru?

2N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.

3Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu: M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.

4Umu-ya nānọpu anya n'ebe nzọputa di, Ewe zọpia ha n'ọnu-uzọ-ama, Ọ dighi kwa onye nānaputa ha.

5Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya, Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya, Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.

6N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta, Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;

7Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ, Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.

8Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum:

9Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi; Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:

10Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala, Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi:

11Ido ndi di ala n'ebe di elu; Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.

12Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ, Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.

13Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.

14N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.

15O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha, Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.

16Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya, Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.

17Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.

18N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u, Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.

19Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi; Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.

20N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu; B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.

21Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi; I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.

22I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì; I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.

23N'ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n'ọb͕ub͕a-ndu; Gi na anu ọhia gādi kwa n'udo.

24I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n'udo; I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa.

25I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu, Umu nke putara n'aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala.

26I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi, Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.

27Le nka, ayi egwuputawo ala-ya, otú a ka ọ di; Nuru ya, gi onwe-gi mata kwa ya n'onwe-gi.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
v>