JOB 6:1-30 IGBOB1970 - Bible AI

1Job we za, si,

2Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma, Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù!

3N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile: N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ.

4N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.

5Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu? Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya?

6Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya? Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá?

7Ihe nkpuru-obim nāju imetu, Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi.

8Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia; Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!

9Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.

10Nkasi-obim we nādiru ub͕u a; M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko: N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.

11Gini bu ikem na m'gēche? Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?

12Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu? Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla?

13Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem? Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ?

14Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya; Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.

15Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi, Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;

16Nke nēji nji n'ihi ice, Nke snow nēzó onwe-ya nime ha:

17Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu: Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha.

18Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha; Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì.

19Ndi-ije nke Tima legidere anya, Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.

20Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi; Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.

21N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe; Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.

22Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe? Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu?

23Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u? Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji?

24Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti: Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.

25Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè! Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara?

26Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba? Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.

27Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà, Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.

28Ma ub͕u a kwenu ichem iru; Ọ̀ bu kwa n'iru unu ka m'gēkwu okwu-ugha?

29Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi; E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.

30Ọ̀ di ajọ omume di n'irem? Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
v>