JOB 7:1-21 IGBOB1970 - Bible AI

1Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa? Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?

2Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò, Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:

3Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu, Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.

4Ọ buru na edinam, m'si, Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya; Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.

5Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá; Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.

6Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà, Ha we gwusia nenweghi olile-anya.

7Cheta na ndum bu ifufe: Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.

8Anya onye nāhum agaghi-ekirim: Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.

9Dika igwe-oji si agwusi, we la, Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.

10Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ, Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.

11Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum; Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm; Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

12Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri, Na I nēdo ndi-nche ichem?

13Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi, Ihe-ndinam gēbupu ntamum;

14I we were nrọ me ka m'tua ujọ, I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:

15Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u, Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.

16Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.

17Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku, Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,

18Na I nēleta kwa ya ututu nile, Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?

19Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya, Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m'lodara ọnu-mirim?

20Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu? N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ, M'we ghọrọ onwem ibu?

21Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
v>