2Rùe ole mb͕e ka i ganēkwu ihe ndia? Rù kwa ole mb͕e ka okwu nile nke ọnu-gi gābu ifufe di ike?
3Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ? Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile, Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ?
4Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya, Ọ we zilaga ha n'aka nmehie-ha:
5Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike, We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara;
6Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu; N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi, Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo.
7Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà, Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku.
8N'ihi na, biko, jua ọb͕o mbu, Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara:
9(N'ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe, N'ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n'elu uwa:)
10Ndi ahu, hà agaghi-ezí gi ihe, gwa gi okwu, Si n'obi-ha weputa okwu?
11Papyrus, Ò gētolite elu ma apiti adighi? Amì, ò gēbù ibù ma miri adighi?
12Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya, Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.
13Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di; Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n'iyì:
14Onye agākpaji okwukwe efu ya, Ntukwasi-obi-ya bu kwa ulo ududo.
15Ọ gādabere n'aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo: Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike.
16Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu, Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige.
17Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n'aru obo nkume, Ọ nāhu ebe nkume anya.
18Ọ buru na esi n'ebe-ya loda ya, Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i.
19Le, nka bu obi-utọ, nke uzọ-ya, Ma ndi ọzọ gēsi n'ájá pue.
20Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè, Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ.
21Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi, Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi.
22Ndi nākpọ gi asì gēyi ihere dika uwe; Ulo-ikwū nke ndi nēmebi iwu agaghi-adi kwa.