JOB 9:1-35 IGBOB1970 - Bible AI

1Job we za, si,

2N'ezie amawom na ọ di otú a: Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke?

3Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé, Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.

4O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?

5Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya, Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya.

6Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya, Ogidi-ya nile we ma jijiji.

7Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa; Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà.

8Onye nání Ya nēseti elu-igwe, Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu.

9Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida.

10Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi; Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi.

11Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya: Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya.

12Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu? Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?

13Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi; Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya.

14Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya, Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?

15Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya; Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.

16Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam; M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;

17Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru, Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.

18Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu, Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.

19Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya! Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?

20Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe: Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.

21Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim; Ajum ndum.

22Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri, Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.

23Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya, Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.

24Enyewo uwa n'aka onye-nmehie: Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya; Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?

25Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ: Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.

26Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì: Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.

27Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum, Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum:

28Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile, Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

29Agama mu onwem ikpe; N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?

30Ọ buru na ewerem miri snow sa arum, Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;

31Mb͕e ahu I gābiayem n'olùlù, Uwem gākpọkwam ihe-árú.

32N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya, Na ayi gābiakota n'ikpé.

33Ọ dighi odozi-okwu di n'etiti ayi, Nke gātukwasi ayi abua aka-ya.

34Ya wezuga nkpa-n'aka-Ya n'arum, Ka oké ujọ-Ya ghara ime ka m'tua egwu nke-uku:

35Ka m'kwue okwu, ghara itu egwu Ya; N'ihi na ọ bughi otú a ka m'di n'ebe mu onwem nọ.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
v>