JOSHUA 12:1-24 IGBOB1970 - Bible AI

1Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu:

2Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;

3na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga:

4na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n'Ashtarot na n'Edrei,

5nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon.

6Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.

7Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n'òkè n'òkè;

8n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'Araba ahu, na nime nkpọrube nile, na n'ọzara, na nime Negeb; ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

9eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n'akuku Bet-el, otù;

10eze Jerusalem, otù; eze Hebron, otù:

11eze Jamut, otù; eze Lekish, otù;

12eze Eglon, otù; eze Gezea, otù;

13eze Debia, otù; eze Geda, otù;

14eze Họma, otù; eze Arad, otù;

15eze Libna, otù; eze Adulam, otù;

16eze Makeda, otù; eze Bet-el, otù;

17eze Tapua, otù; eze Hefa, otù;

18eze Efek, otù; eze Lasharon, otù;

19eze Madon, otù; eze Hezoa, otù;

20eze Shimron-meron, otù; eze Akshaf, otù;

21eze Teanak, otù; eze Megido, otù;

22eze Kedesh, otù; eze Jọkneam nime Kamel, otù;

23eze Doa n'ebe di elu nke Doa, otù; eze Goim nime Gilgal, otù;

24eze Tiaza, otù: eze ahu nile di orú na iri na otù.